Psalms 100

Abụ Ọma maka ikele ekele afọ ojuju.

Toonu Chineke

1Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile.
2Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe;
jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya
3Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke.
Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị,
anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ.

4Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya
jiri otuto baa nʼogige ya;
keleenụ ya, tookwa aha ya.
5Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.
Copyright information for IboBIU